Isaiah 3

Ahụhụ dịrị Juda na Jerusalem

1Nʼihi na, lee, Onyenwe anyị,
bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
na-akwado isite na Jerusalem na Juda
wezuga ihe nnweta na ihe nkwado niile,
ya na ihe oriri niile na mmiri ọṅụṅụ niile.
2Ọ ga-ewezugakwa ndị bụ dike nʼetiti ha, na onye agha,
na onye ikpe, na onye amụma,
na onye na-ajụ ase, na ndị okenye ha,
3na onyeisi agha na-achị ndị agha iri ise, na onye a na-asọpụrụ,
na onye ndụmọdụ, na onye ọka maara ọrụ, na onye nwere ezi mmụọ nghọta ịkọ mmadụ ibe ya ọgwụ.

4“Aga m eme ka ụmụ okorobịa ghọọ ndị ozi ha,
meekwa ka ụmụ na-aṅụ ara bụrụ ndị ịchị isi dị nʼaka ha.”

5Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha,
otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya.
Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye,
ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ.

6Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke
nʼụlọ nna ya sị ya,
“I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị;
lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.”
7Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị,
“O nweghị ihe m pụrụ ime.
Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m.
Emela m onyendu ndị a.”

8Lee na Jerusalem na-asọ ngọngọ.
Juda na-adakwa. a
Nʼihi na ndị bi nʼime ya ekwujọọla Onyenwe anyị.
Ha na-elelịkwa, ma na-enupu isi nʼebube Onyenwe anyị.
9Ihu ha na-egosi ihe ha bụ. Ọ na-ezipụta ajọ omume ha.
Ha na-anya isi nʼime mmehie ha dịka Sọdọm.
Ihere adịghịkwa eme ha.
Ahụhụ ga-adịrị ha,
nʼihi na ha ejirila aka ha kpatara onwe ha ahụhụ.

10Zie ndị ezi omume niile ozi sị ha, na ihe ga-agara ha nke ọma,
nʼihi na mkpụrụ sitere nʼomume ha niile ka ha ga-eri. b
11Ma gwa ndị na-emebi iwu na ahụhụ dịrị ha.
Mbibi adakwasịla ha!
Ha ga-eketa oke ruoru ha,
nʼihi ihe aka ha kpataara ha.

12Ụmụ okorobịa na-emegbu ndị m,
ụmụ nwanyị na-achịkwa ha.
Ndị m, lee na ndị na-achị unu na-eduhie unu ụzọ.
Ha na-eme ka unu kpafuo; ha esitela nʼezi ụzọ wezuga unu.

13 Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe;
ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe.
14Onyenwe anyị na-aba nʼikpe
megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile.
Nʼihi na ọ bụ ha na-emegbu ndị ya

Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi;
ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu.
15Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m,
“Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?”
Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.

16Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị,
“Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako.
Ha ji olu e setịrị eseti,
na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị.
Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu,
na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda.
17Nʼihi ya, Onyenwe anyị ga-eme ka ọnya jupụta nʼisi ndị inyom Zayọn,
Onyenwe anyị ga-emekwa ka ha gharakwa inwe agịrị isi nʼisi ha.”
18Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-anapụ ha ihe ịchọ mma ha niile, ma mgbaaka, ma ịchafọ ịgbado isi, ma ihe olu nke dị nʼụdịdị ọnwa ọhụrụ, 19ma ọlantị, ma mgbaaka, ma akwa e ji ekpuchi ihu, 20ma akwa ha na-eyi nʼisi, na ọla ụkwụ, ma ihe ha na-eke nʼukwu, ma karama mmanụ isi ụtọ, ma ọgwụ dị iche iche; 21ma ọlaaka ha niile na ọla imi ha niile, 22ma uwe mmemme ha niile ma uwe mwụda niile, ma akwa akwa mgbochi, ma akpa nta niile, 23ma enyo ha niile, ma akwa ọcha niile, ma okpu ọma niile, ma mgbokwasị ha niile.

24Nʼọnọdụ ụda ọma, ha ga-esi ure ure;
nʼọnọdụ ihe ike nʼukwu, ha ga-ekekwasị onwe ha eriri;
nʼọnọdụ agịrị isi e doziri edozi, ha agaghị enwe ọ bụladị otu agịrị isi;
nʼọnọdụ akwa ọcha, ọ bụ akwa mkpe ka ha ga-eyi;
nʼọnọdụ ịma mma, anụ ahụ ha ga-achakpọsị.
25Ndị ikom unu ka a ga-eji mma agha gbuo,
ndị bụ dike ka a ga-egbu nʼagha.
26Ọnụ ụzọ ama niile nke Zayọn ga-eti mkpu akwa ruokwa ụjụ.
Ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-anọdụ nʼala.
Copyright information for IboBIU